14Obi gị ọ ga-esikwa ike? Ị ga-eguzokwa nʼụbọchị m ga-ekpe gị ikpe? Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola. Aga m emezukwa ya.
15Aga m achụsa unu nʼetiti mba niile, fesaa unu nʼetiti mba niile. Aga m emekwa ka adịghị ọcha unu kwụsị.
16Mgbe e mere ka ị ghara ịdị nsọ nʼanya ndị mba dị iche iche, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
17Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
18“Nwa nke mmadụ, ụlọ Izrel aghọọlara m ihe efu. Ha niile aghọọla ọla, na gbamgbam, na igwe, na ọla opu a hapụrụ nʼọkụ. Ha bụ nnọọ ihe efu nke ọlaọcha.