18“Nwa nke mmadụ, ụlọ Izrel aghọọlara m ihe efu. Ha niile aghọọla ọla, na gbamgbam, na igwe, na ọla opu a hapụrụ nʼọkụ. Ha bụ nnọọ ihe efu nke ọlaọcha.
19Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: ‘Nʼihi na unu niile aghọọla ihe efu, aga m achịkọta unu nʼime Jerusalem.
20Dịka a na-achịkọta ọlaọcha, na ọla, na igwe, na opu, na gbamgbam, tinye ha nʼoke ọkụ ka ha gbazee, otu a ka m ga-esite nʼiwe m na ọnụma m chịkọtaa unu nʼime obodo ahụ gbazee unu.
21Aga m achịkọta unu, fụkwasị unu ọkụ nke ọnụma m, mee ka unu gbazee nʼime ya.
22Dịka ọlaọcha si agbaze nʼọkụ, otu a ka unu ga-esi gbazee nʼime ya. Unu ga-amatakwa nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị awụkwasịla unu iwe m.’ ”