24“Nwa nke mmadụ, gwa ala ahụ okwu, ‘Ị bụ ala nke a na-emebeghị ka ọ dị ọcha, maọbụ mmiri izokwasị ya nʼụbọchị ọnụma.’
25E nwere izuzu ọjọọ nke ndị ụmụ eze nọ nʼime ya, dịka ọdụm nke na-agbọ ụja na-adọgbu anụ ọ na-eri eri, ha na-eripịa ndị mmadụ. Ha ewerela akụ ha na ihe ha niile dị oke ọnụahịa, mekwa ka ụmụ nwanyị na-enweghị di baa ụba nʼetiti ya.
26Ndị nchụaja ya na-enupu isi nʼiwu m niile, mee ka ihe nsọ m niile gharakwa ịdị nsọ, nʼebe nsọ m. Ha adịghị akpakwa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ. Ha na-ezi ndị m na ihe dị iche ọbụla adịghị nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha. Ha adịghị akpọkwa ụbọchị izuike m ihe ọbụla. Nʼihi ya, e mere ka m ghara ịdịkwa nsọ nʼetiti ha.
27Ndịisi nọ nʼime gị dịka nkịta ọhịa na-adọgbu anụ o gbutara. Ha na-awụsi ọbara, ime ka mkpụrụobi mmadụ laa nʼiyi nʼihi uru akpa ha.
28Ndị amụma ha eteela nzu nʼọrụ ha niile site nʼọhụ ụgha nʼịgba afa ụgha mgbe ha na-ahụghị ọhụ ọbụla. Ha na-asị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,’ mgbe Onyenwe anyị na-ekwughị ihe ọbụla.