Izikiel 23

“Oholiba bụ nwanne ya nwanyị hụrụ ihe ndị a, ma nʼime agụụ ihe ọjọọ nke gụrụ ya nakwa ịgba akwụna, ọ kpara agwa jọrọ njọ karịa nke nwanne ya nwanyị.

Ezekiel 23:11 (UKJV) And when her sister Aholibah saw this, she was more corrupt in her inordinate love than she, and in her whoredoms more than her sister in her whoredoms.

9“Nʼihi nke a enyefere m ya nʼaka ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, bụ ndị Asịrịa, ndị agụụ ha na-agụ ya.

10Ha gbara ya ọtọ, ha kpọọrọ ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, ma ya onwe ya ka ha were mma agha gbuo. Nʼụzọ dị otu a, ọ ghọrọ ihe akụkọ ilu nʼetiti ndị inyom niile, a takwara ya ahụhụ.

11“Oholiba bụ nwanne ya nwanyị hụrụ ihe ndị a, ma nʼime agụụ ihe ọjọọ nke gụrụ ya nakwa ịgba akwụna, ọ kpara agwa jọrọ njọ karịa nke nwanne ya nwanyị.

12Ya onwe ya kwa, agụụ ụmụ Asịrịa gụrụ ya, bụ ndịisi ọchịchị, na ndị ọchịagha, ndị dike nʼagha yi uwe agha dịka o kwesiri, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya, ha niile bụ ụmụ okorobịa dị mma nʼile anya.

13Ahụrụ m na ya onwe ya merụkwara onwe ya; ha abụọ si otu ụzọ aga.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.