12Ya onwe ya kwa, agụụ ụmụ Asịrịa gụrụ ya, bụ ndịisi ọchịchị, na ndị ọchịagha, ndị dike nʼagha yi uwe agha dịka o kwesiri, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya, ha niile bụ ụmụ okorobịa dị mma nʼile anya.
13Ahụrụ m na ya onwe ya merụkwara onwe ya; ha abụọ si otu ụzọ aga.
14“O gara nʼihu tụkwasị ihe nʼịgba akwụna ya karịa. Ọ hụrụ onyinyo ndị ikom atụnyere nʼahụ aja, bụ onyinyo nke ndị Kaldịa e ji ihe chara uhie uhie sepụta,
15ha kere ihe okike nʼukwu ha nakwa akwa okike nʼisi ha; nʼile anya ha niile dịka ndịisi ụgbọ agha ndị Babilọn, Kaldịa bụ ala amụrụ ha.
16Ngwangwa ọ na-ele ha anya, agụ ha gụrụ ya, o zipụrụ ha ndị ozi na Kaldịa.