Izikiel 23

Ha ga-eyipụ gị uwe ọma gị niile, chikọrọ ihe ịchọ mma gị niile.

Ezekiel 23:26 (UKJV) They shall also strip you out of your clothes, and take away your fair jewels.

24Ha ga-eji ngwa agha dị iche iche, ụgbọala nke agha na ọtụtụ igwe ndị mmadụ dị iche iche; ha ji ọta ukwu na ọta nta, kpurukwa okpu agha igwe, were ọnọdụ gburugburu gị nʼakụkụ ọbụla, imegide gị. Aga m enyefe gị nʼaka ha, ka ha taa gị ahụhụ, ha ga-atakwa gị ahụhụ dịka usoro ikpe ha si dị.

25Aga m edo ekworo nke iwe m megide gị, ha ga-eji iwe na ọnụma mesie gị ike. Ha ga-ebipụ imi unu na ntị unu, ndị fọdụkwara nʼime unu ga-anwụ site na mma agha. Ha ga-achịkọrọ ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom pụọ, unu ndị nke fọdụrụ ka ọkụ ga-erepịa.

26Ha ga-eyipụ gị uwe ọma gị niile, chikọrọ ihe ịchọ mma gị niile.

27Nʼụzọ dị otu a, a ga-eme ka agụ ọchịchọ ọjọọ nke anụahụ na ịkwa iko, bụ nke i bidoro nʼala Ijipt kwụsị. Ị gaghị enwekwa agụụ ile ihe ndị a niile anya maọbụ chetakwa Ijipt nʼuche gị.

28“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m aga iwere gị nyefee nʼaka ndị ahụ kpọrọ gị asị, bụ ndị ahụ ị wezugara onwe gị site nʼebe ha nọ nʼihi ịsọ oyi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.