27Nʼụzọ dị otu a, a ga-eme ka agụ ọchịchọ ọjọọ nke anụahụ na ịkwa iko, bụ nke i bidoro nʼala Ijipt kwụsị. Ị gaghị enwekwa agụụ ile ihe ndị a niile anya maọbụ chetakwa Ijipt nʼuche gị.
28“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m aga iwere gị nyefee nʼaka ndị ahụ kpọrọ gị asị, bụ ndị ahụ ị wezugara onwe gị site nʼebe ha nọ nʼihi ịsọ oyi.
29Ha ga-esite nʼịkpọ asị mesie gị ike, pụnara gị ihe niile i nwere nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ha. Ha ga-ahapụ gị ka ịgbara ọtọ ihu na azụ, mgbe ahụ ihere nke ịgba akwụna gị ga-apụta ihe. Agụụ nke ọchịchọ ọjọọ na ịkwa iko gị
30emeela ka ihe ndị a bịakwasị gị, nʼihi na agụụ mmekọrịta nʼebe mba ndị ọzọ gụrụ gị, ị jikwa arụsị ha merụọ onwe gị.
31Ị gbasoro nzọ ụkwụ nwanne gị nwanyị, nʼihi ya, aga m ewere iko ya tinye gị nʼaka.