32“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “Iko nwanne gị nwanyị ka ị ga-aṅụ bụ iko sara mbara ma dịkwa omimi; nke ga-eme ka ị ghọọ onye a na-achị ọchị na onye a na-akwa emo, nʼihi na ọ na-anagide ihe dị ukwuu.
33Ị ga-ejupụta nʼịṅụbiga mmanya oke na iru ụjụ, nʼihi iko mbibi na ntikpọsi, bụ iko nke nwanne gị nwanyị bụ Sameria.
34Ị ga-aṅụ ya, ṅụchaa ihe dị nʼiko ahụ. Ị ga-atapịakwa iberibe ya niile, dọkasịakwa ara gị abụọ. Ekwuola m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
35“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na i chefuola m, gbakụta m azụ gị, ị ga-ata ahụhụ niile ruuru gị nʼihi mmehie, agụụ ọchịchọ ọjọọ na ịgba akwụna gị.”
36Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe Ohola na Oholiba ikpe? Mgbe ahụ, guzogide ha mee ka ha mara ihe arụ niile ha na-eme.