38Ihe ọzọ ha mere m bụ nke a: Ha merụrụ ebe nsọ m nʼotu ụbọchị ahụ ha mere ka ụbọchị izuike m gharakwa ịdị nsọ.
39Nʼihi na nʼotu ụbọchị ahụ ha ji ụmụ ha chụọ aja nye arụsị ha, bụkwa ụbọchị ha batara nʼụlọnsọ m merụọ ya. Ihe dị otu a ka ha mere nʼụlọnsọ m.
40“Ọ bụghị naanị nke a, ha zigara ndị ozi ịkpọ ndị ikom na-esi ebe dị anya bịa, mgbe ha bịara, nʼihi ha, ị sachara ahụ gị nke ọma, tee ihe nʼanya gị, yirikwa ezigbo ihe ịchọ mma gị.
41Ị nọdụrụ nʼelu ihe ndina e doziri nke ọma, na tebul e doro nʼusoro dịkwa nʼihu ya nke ị dọbara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na mmanụ oliv bụ nke m nʼelu ya.
42“Olu igwe mmadụ ndị obi dị ụtọ na-ada gburugburu ya nʼime ụlọ, e sitekwara nʼọzara bubata ndị ṅụbigara mmanya oke, ha na ọtụtụ ndị ọzọ, Ha gbanyekwara nwanyị a na nwanne ya nwanyị mgbaaka na nkwoji aka ha, yinyekwa ha okpueze mara mma nʼisi.