14“ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Oge m ji emezu ihe m kwuru eruola. Agaghị m ahapụ imezu ya. Agaghị m eme ebere maọbụ weghachi aka m azụ. A ga-ekpe gị ikpe dịka omume na obibi ndụ gị si dị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
15Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
16“Nwa nke mmadụ, ana m aga iwere ihe otiti napụ gị onye ahụ ihe ya na-atọ gị ụtọ. Ma mgbe o mere, ị gaghị eti aka nʼobi maọbụ kwaa akwa. Anya mmiri agakwaghị esi gị nʼanya pụta.
17I nwere ike sụọ ude, ma asụsila ya ike. Ị gaghị eru uju nʼihi onye nwụrụ anwụ. Kechie isi gị, yirikwa akpụkpọụkwụ gị, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ na-eri.”
18Agwara m ndị mmadụ okwu a nʼụtụtụ, ma nʼanyasị nwunye m nwụrụ. Nʼụtụtụ echi ya, emere m ihe niile dịka e siri nye m ya nʼiwu.