9Ọ ga-echezikwa ihe agha e ji akwatu mgbidi nʼebe mgbidi gị dị, jiri ngwa agha ya kwada ụlọ elu gị niile.
10Ịnyịnya ya ga-adị ọtụtụ nke ga-eme ka ha jiri uzuzu kpuchie gị. Mgbidi gị ga-ama jijiji nʼihi oke ụzụ nke ịnyịnya agha ndị a, na ụgbọ agha, na wagọn ịnyịnya na-adọkpụ ga-eme, mgbe ha na-abata nʼọnụ ụzọ ama gị, dị ka mgbe ọtụtụ mmadụ na-abanye nʼime obodo e tidara mgbidi ya.
11Ọ ga-eji ụkwụ ịnyịnya ya niile zọtọọ okporoụzọ gị niile, jirikwa mma agha gbuchapụ ndị gị niile. Ogidi niile nke ike gị ga-adaru ala.
12Ha ga-akwara akụ gị niile, na ihe ahịa gị niile dịka ihe ha dọtara nʼagha. Ha ga-akwatu mgbidi gị niile, na ụlọ ọma gị niile, kpokọtaa osisi gị niile, na nkume niile, na ngwongwo niile nʼabaghị uru wụnye ha nʼime osimiri.
13Aga m emekwa ka ụzụ nke abụ gị niile kwụsị. A gaghị anụkwa ụda ụbọ akwara gị ọzọ.