18Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị, i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ. Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta, repịa gị. Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala, nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya.
19Ndị niile maara gị ka ihe ndị a juru anya, nʼihi na ị ghọọla ihe oke egwu. Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ”
20Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
21“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya,
22ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn, nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m. Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị mgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu, nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ.