Izikiel 28

“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị Izrel ga-alọghachi biri nʼala nke aka ha ọzọ, ala nke m nyere nna ha Jekọb ohu m. Nʼihi na aga m esite na mba niile ha gbasasịrị chịkọtaa ha, si otu a gosi mba niile nke ụwa ịdị nsọ m.

Ezekiel 28:25 (UKJV) Thus says the Lord GOD; When I shall have gathered the house of Israel from the people among whom they are scattered, and shall be sanctified in them in the sight of the heathen, then shall they dwell in their land that I have given to my servant Jacob.

23Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya, meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile. Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya, site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

24“ ‘Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.

25“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị Izrel ga-alọghachi biri nʼala nke aka ha ọzọ, ala nke m nyere nna ha Jekọb ohu m. Nʼihi na aga m esite na mba niile ha gbasasịrị chịkọtaa ha, si otu a gosi mba niile nke ụwa ịdị nsọ m.

26Ha ga-ebi nʼala a na ntụkwasị obi. Ha ga-ewu ụlọ, kụọ ubi vaịnị, birikwa na-atụghị egwu ọbụla. Mgbe m pịachara mba niile dị ha gburugburu ụtarị, bụ mba ndị ahụ mekpara ha ahụ, mgbe ahụ, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.