19Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu, ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
20O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
21“Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha.
22Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ.
23Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile,