18“Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa nʼihi usuu ndị agha Ijipt niile, wezuga ha baa nʼokpuru ụwa ma ndị inyom mba dị iche iche dị ukwuu, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu.
19Gwa ha okwu sị ha, ‘Unu o nwere ihuọma karịa ndị ọzọ? Lee, ihe na-eche gị bụ olulu. Ọ bụkwa ndị a na-ebighị ugwu ka ị ga-edinakwuru.’
20Nʼetiti ndị e ji mma agha gbuo ka ha ga-ada. Amịpụtala mma agha maka ya, ka a dọkpụrụ ya na igwe ndị ya niile pụọ.
21Ndị dike nke ndị ndu dike ga-esite nʼala mmụọ kwuo banyere Ijipt na ndị niile ha na ya dị na mma, ‘Ha arịdatala, ha na-edina ala ha na ndị a na-ebighị ugwu, nakwa ndị niile ahụ e ji mma agha gbuo.’
22“Nʼebe ahụ ka Asịrịa na ndị agha ya niile nọ; ili ndị niile o gburu egbu gbara ya gburugburu, bụ ndị niile nwụrụ site na mma agha.