18Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-ata nri kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ zọtọsịa nke fọdụrụ? Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-aṅụ mmiri nke kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ unu na-agbarụ nke fọdụrụ?
19Ọ bụ ihe kwesiri ekwesi na igwe atụrụ m ga-ata nri unu zọtọrọ azọtọ, ma ṅụọkwa mmiri unu gbarụrụ agbarụ?
20“ ‘Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ha, nʼezie, mụ onwe m ga-ekpe ikpe nʼetiti atụrụ ndị gbara abụba, na atụrụ ndị a tara ahụ.
21Nʼihi na unu ji akụkụ ahụ unu, na ubu aka unu na-enupu ha. Unu jikwa mpi unu na-enupu ndị na-adịghị ike, tutu ruo mgbe unu chụsachara ha.
22Lee, aga m azọpụta igwe ewu na atụrụ m. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya. Ha agaghị aghọkwa ihe oriri ọzọ. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya.