Izikiel 34

Osisi ọhịa ga-amị mkpụrụ ya, ala ga-eme ihe omume ya. Ndị m ga-anọkwa nʼudo nʼala ha na-atụghị ụjọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tijasịrị mkpọrọ yoku niile ha, napụta ha site nʼaka ndị na-akpagbu ha.

Ezekiel 34:27 (UKJV) And the tree of the field shall yield her fruit, and the earth shall yield her increase, and they shall be safe in their land, and shall know that I am the LORD, when I have broken the bands of their yoke, and delivered them out of the hand of those that served themselves of them.

25“ ‘Mụ na ha ga-agba ndụ udo. Aga m achụpụkwa anụ ọjọọ niile nʼala ha, ka ndị m nwee ike ibi nʼudo nʼọzara, ma rahụkwa ụra ọ bụladị nʼetiti oke ọhịa nʼenweghị nsogbu.

26Aga m agọzi ndị m, gọziekwa ebe obibi ha na ihe niile gbara ugwu nta m gburugburu. Aga m ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, nʼezie, ngọzị ga-ezoro ha dịka mmiri.

27Osisi ọhịa ga-amị mkpụrụ ya, ala ga-eme ihe omume ya. Ndị m ga-anọkwa nʼudo nʼala ha na-atụghị ụjọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tijasịrị mkpọrọ yoku niile ha, napụta ha site nʼaka ndị na-akpagbu ha.

28Ha agaghị abụkwa mba ndị ọzọ na-apụnara ihe ha nwere, maọbụ ndị anụ ọhịa ga-adọgbu. Ha ga-ebi na-atụghị ụjọ, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.

29Aga m enye ha ala nke amaara nke ọma nʼihi ihe na-epupụta nʼime ya, ha agaghị abụkwa ndị ụnwụ mekpara ahụ nʼala ahụ ọzọ, maọbụ ihe a na-akwa emo nke mba dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.