29Aga m enye ha ala nke amaara nke ọma nʼihi ihe na-epupụta nʼime ya, ha agaghị abụkwa ndị ụnwụ mekpara ahụ nʼala ahụ ọzọ, maọbụ ihe a na-akwa emo nke mba dị iche iche.
30Ha ga-amata na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke ha, na m na-anọnyere ha, na ha onwe ha kwa, bụ ụlọ Izrel, bụ ndị m, otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwupụtara.
31Unu bụ igwe ewu na atụrụ m, atụrụ nke ebe ịta nri m, mụ onwe m bụkwa Chineke unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”