13Unu nyakwara isi megide m, kwuo okwu kwugide m dịka o si dị unu mma. Anụkwara m ihe niile unu kwuru.
14Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Mgbe ụwa niile na-aṅụrị ọṅụ ka m ga-eme ka ị ghọọ mkpọmkpọ ebe.
15Dịka ị ṅụrịrị ọṅụ mgbe ihe nketa Izrel ghọrọ mkpọmkpọ ebe, otu a ka m ga-esi mesoo gị mmeso. Ị ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ nʼefu, gị ugwu Sia, gị na ndị Edọm niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”