Izikiel 36

Aga m eme ka ịdị nsọ nke aha ukwuu m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile, pụta ìhè. Mgbe ahụ, mba niile ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, mgbe a ga-edo m nsọ site nʼime unu nʼanya ha.

Ezekiel 36:23 (UKJV) And I will sanctify my great name, which was profaned among the heathen, which all of you have profaned in the midst of them; and the heathen shall know that I am the LORD, says the Lord GOD, when I shall be sanctified in you before their eyes.

21Ihe na-ewutekwa m bụ aha nsọ m, nke ụlọ Izrel mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile bụ ebe ha gara.

22“Ya mere, gwa ụlọ Izrel, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụghị nʼihi na unu, ụlọ Izrel, ka m ji na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ nʼihi aha nsọ m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile dị iche iche ebe ndị unu gara.

23Aga m eme ka ịdị nsọ nke aha ukwuu m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile, pụta ìhè. Mgbe ahụ, mba niile ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, mgbe a ga-edo m nsọ site nʼime unu nʼanya ha.

24“ ‘Nʼihi na aga m esi na mba niile dị iche iche kpọpụta unu. Aga m achịkọta unu site nʼala niile, mee ka unu bata nʼala unu.

25Aga m efekwasị unu mmiri dị ọcha, unu ga-adịkwa ọcha. Aga m eme ka unu dị ọcha site na-adịghị ọcha unu niile, na site nʼikpere arụsị unu niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.