Izikiel 36

Ala ubi ndị ahụ nke tọgbọrọ nʼefu agaghị atọgbọkwa nʼefu nʼihu anya ndị na-agafe agafe. A ga-akọkwa ha niile.

Ezekiel 36:34 (UKJV) And the desolate land shall be tilled, whereas it lay desolate in the sight of all that passed by.

32Ma achọrọ m ka unu mata na ọ bụghị nʼihi mma unu ka m ji na-eme ihe ndị a. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Unu ụlọ Izrel, ihere kwesiri ime unu nʼihi omume ọjọọ unu mere.

33“ ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ m ga-eme ka ị dị ọcha site na mmehie gị niile, aga m eme ka unu lọghachi nʼobodo unu biri, a ga-ewugharịkwa ebe niile tọgbọrọ nʼefu.

34Ala ubi ndị ahụ nke tọgbọrọ nʼefu agaghị atọgbọkwa nʼefu nʼihu anya ndị na-agafe agafe. A ga-akọkwa ha niile.

35Mgbe ahụ, ha ga-asị, “Ala a, nke naara atọgbọ nʼefu, aghọọla ubi a gbara ogige, nke yiri ogige Iden. Leekwa na obodo niile ndị ahụ e tikpọrọ etikpọ, ka e wuzikwara, werekwa mgbidi gbaa ha ogige. Ugbu a, ndị mmadụ jupụtakwara nʼime ha.”

36Mgbe ahụ, mba niile gbara unu gburugburu, bụ ndị fọdụrụ, ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị wuziri ebe niile e tikpọrọ etikpọ, kụọkwa mkpụrụ nʼebe niile tọgbọrọ nʼefu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ekwuola, aga m emekwa ya.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.