Izikiel 37

Ebe obibi m ga-abụkwa nʼetiti ha. E, aga m abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.

Ezekiel 37:27 (UKJV) My tabernacle also shall be with them: yea, I will be their God, and they shall be my people.

25Ha ga-ebi nʼala ahụ m nyere ohu m Jekọb, ala ebe nna nna ha biri. Ha na ụmụ ha ga-ebi nʼime ya. Ụmụ ụmụ ha ruo ọgbọ niile ga-ebikwa nʼime ya. Ohu m Devid ga-abụ eze ha ruo ebighị ebi.

26Mụ na ha ga-agba ndụ udo, ọgbụgba ndụ nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Aga m agọzi ha, mee ka ha baa ụba. Nʼetiti ha kwa ka ụlọnsọ m ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.

27Ebe obibi m ga-abụkwa nʼetiti ha. E, aga m abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.

28Mgbe ụlọnsọ m ga-adị nʼetiti ha ruo ebighị ebi, mba niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-edo Izrel nsọ.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.