Izikiel 38

Gị onwe gị, na ndị agha gị niile, na ọtụtụ ndị mba ahụ dị iche iche ndị na-eso gị, jiri ọsọ, dịka ikuku siri ike, rigoo, kpuchie ala ahụ dịka igwe ojii.

Ezekiel 38:9 (UKJV) You shall ascend and come like a storm, you shall be like a cloud to cover the land, you, and all your bands, and many people with you.

7“ ‘Jikere! Jikere onwe gị, gị onwe gị na usuu ndị agha ahụ nọ gị gburugburu, gị Gog, bụrụkwa onyendu ha.

8Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, a ga-akpọlite gị ibu agha. Nʼogologo oge dị nʼihu, ị ga-ebuso ala ahụ agha bụ ala ahụ na-enwetaghachi onwe ya site na mbibi nke ibu agha; ala ahụ e si na mba dị iche iche chịkọtaa ndị bi nʼime ya, mee ka ha birikwa nʼugwu niile nke Izrel ahụ naara atọgbọ nʼefu. E bulatara ha site na mba dị iche iche, ma ugbu a, ha anọrọla nʼudo.

9Gị onwe gị, na ndị agha gị niile, na ọtụtụ ndị mba ahụ dị iche iche ndị na-eso gị, jiri ọsọ, dịka ikuku siri ike, rigoo, kpuchie ala ahụ dịka igwe ojii.

10“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ, echiche ọjọọ ga-abata nʼobi gị, mgbe ị na-atule ọtụtụ ihe dị iche iche nʼobi gị.

11Ị ga-asị, “Aga m ebuli megide nʼala na-enweghị mgbidi, aga m awakpo ndị nọ nʼudo na-adịghị atụ anya nsogbu ọbụla, ha niile bụ ndị bi nʼebe na-enweghị mgbidi, ha enweghịkwa ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.