12Ị ga-eri ya dịka ogbe achịcha ọka balị, ị ga-eghe ya nʼelu nsị mmadụ kpọrọ nkụ mgbe ndị mmadụ nọ na-ele gị anya.”
13Onyenwe anyị kwuru, “Otu a ka ndị Izrel ga-esi rie nri rụrụ arụ, nʼetiti mba dị iche iche ebe m ga-achụga ha.”
14Mgbe ahụ, asịrị m, “E e, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee, emerụbeghị m onwe m site na nwantakịrị m ruo ugbu a, eribeghị ihe ọbụla nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, anụ na-adịghị ọcha abatụbeghị m nʼọnụ.”
15Ọ sịrị, “Ọ dị mma, aga m enye gị nsị ehi nʼọnọdụ nke mmadụ, nʼelu ya ka ị ga-akwado achịcha gị.”
16Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, lee, aga m eme ka nri kọ na Jerusalem; ha ga-eji nchegbu rie nri a tụpụtara atụpụta, jirikwa egwu ṅụọ mmiri e kupụtara ekupụta.