Izikiel 40

Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara ọnụ ụzọ ama ahụ, site nʼelu ụlọ nke otu ime ụlọ ruo nʼelu ụlọ nke ime ụlọ chere ya ihu; obosara ya dị mita iri na atọ, site nʼotu oghere ruo nʼoghere nke chere ya ihu.

Ezekiel 40:13 (UKJV) He measured then the gate from the roof of one little chamber to the roof of another: the breadth was five and twenty cubits, door against door.

11Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara nke mbata ọnụ ụzọ ama ahụ, ọ dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, na mita isii na ụma itoolu nʼogologo.

12Nʼihu oghere niile nke ụlọ ahụ e nwere mgbidi dị otu ọkara mita nʼịdị elu ya. Akụkụ anọ nke oghere ndị a ha otu. Ha ruru mita atọ mita atọ.

13Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara ọnụ ụzọ ama ahụ, site nʼelu ụlọ nke otu ime ụlọ ruo nʼelu ụlọ nke ime ụlọ chere ya ihu; obosara ya dị mita iri na atọ, site nʼotu oghere ruo nʼoghere nke chere ya ihu.

14Ọ tụrụ ogologo ogidi niile dị nʼakụkụ nʼime mgbidi ọnụ ụzọ ama ụlọ ahụ, chọpụta na ọ dị iri mita atọ na abụọ, ọ bụladị ruo nʼakụkụ mgbidi nke chere ihu nʼọnụ ụzọ ama ogige ahụ.

15Site nʼihu ọnụ ụzọ ama mbata ahụ, ruo nʼebe ngwụcha nke ọnụ ụzọ dị na mpụta ọnụ ụlọ ya dị iri mita abụọ na asaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.