Izikiel 41

na ọnụụlọ ndị nchụaja dị mita iri na ọkara nʼobosara, gbaa gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ.

Ezekiel 41:10 (UKJV) And between the chambers was the wideness of twenty cubits round about the house on every side.

8Ahụrụ m na ụlọnsọ ukwu ahụ nwere ebe e wuliri elu nʼakụkụ ya niile. Ọ bụkwa ebe a dị elu ka e ji mee ntọala ọnụụlọ nta ndị ahụ niile. Ịdị ogologo nke ebe ahụ e wuliri elu bụ mita atọ na ụma abụọ.

9Ịdị arọ nke mgbidi ọnụụlọ nta ndị a nʼakụkụ ezi bụ mita abụọ na ụma atọ. Ala tọgbọrọ nʼefu nʼetiti ọnụụlọ nta ụlọnsọ ukwu ahụ,

10na ọnụụlọ ndị nchụaja dị mita iri na ọkara nʼobosara, gbaa gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ.

11E nwere ọnụ ụzọ ndị a na-esi abanye nʼọnụụlọ nta ndị ahụ, site nʼala ahụ na-enweghị ihe arụrụ na ya, otu ọnụ ụzọ nʼakụkụ ugwu, nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Obosara ala nke fọdụrụ dị mita abụọ na ụma atọ nʼakụkụ niile gbaa gburugburu.

12Ma ụlọ nke na-eche ihu nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, dị iri mita atọ na asaa nʼobosara, ịdị igbidi nke aja ụlọ ahụ dị mita abụọ na ụma atọ, gbaa gburugburu, ogologo ya dịkwa iri mita anọ na asatọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.