13Mgbe ahụ, ọ tụrụ ụlọnsọ ukwu ahụ, ya dịrị iri mita ise na atọ, ogige ụlọnsọ, na ụlọ ahụ nakwa mgbidi ya, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo.
14Obosara nke ogige ụlọnsọ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, tinyere ebe ihu ụlọnsọ ukwu ahụ, dị iri mita ise na atọ.
15Ọ tụrụ ịdị ogologo nke ụlọ ahụ chere ihu nʼogige dị nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, tinyere ebe njegharị ya nke dị nʼakụkụ abụọ ya. Ọ dị iri mita ise na atọ. Ụlọ ezumezu ahụ, nʼime ebe nsọ ahụ, na mpụta nke ọnụ ụlọ, bụ nke chere ihu nʼogige ahụ,
16ya na ọnụ ụzọ ndị ahụ, na oghereikuku niile dị warawara, na ebe njegharị gbara ha atọ gburugburu, ihe niile, elu ma ala, tinyere ọnụ ụzọ bụ nke eji osisi mmachite. Ala ya, na mgbidi ya ruo na oghereikuku, ma oghereikuku niile bụkwa ihe ekpuchiri ekpuchi.
17Nʼelu oghere dị nʼebe ọnụ ụzọ ezi, nke gara nʼime ebe nsọ, nakwa nʼahụ aja niile, na nkebi na nkebi, gbaa gburugburu nʼime na nʼezi ebe nsọ ahụ,