Izikiel 41

otu akụkụ cherub nke bụ ihu mmadụ chere ihu nʼotu nkwụ. Ihu ya nke ọzọ, nke bụ ihu ọdụm, chere ihu na nkwụ nke dị akụkụ nke ọzọ. A tụrụ ha gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ.

Ezekiel 41:19 (UKJV) So that the face of a man was toward the palm tree on the one side, and the face of a young lion toward the palm tree on the other side: it was made through all the house round about.

17Nʼelu oghere dị nʼebe ọnụ ụzọ ezi, nke gara nʼime ebe nsọ, nakwa nʼahụ aja niile, na nkebi na nkebi, gbaa gburugburu nʼime na nʼezi ebe nsọ ahụ,

18ka a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ. Cherubim na-esota osisi nkwụ. Osisi nkwụ ọbụla na-esotakwa cherubim. Cherub ọbụla nwere ihu abụọ:

19otu akụkụ cherub nke bụ ihu mmadụ chere ihu nʼotu nkwụ. Ihu ya nke ọzọ, nke bụ ihu ọdụm, chere ihu na nkwụ nke dị akụkụ nke ọzọ. A tụrụ ha gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ.

20Site nʼala ụlọ ruo nʼelu ọnụ ụzọ ya, a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ nʼahụ aja ụlọ ezumezu ahụ.

21Ọnụ ụlọ ezumezu ahụ nwere mbudo ibo nke akụkụ anọ ya ha otu nʼọtụtụ. Nke dị nʼihu Ebe ahụ Kachasị Nsọ, yiri ndị ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.