Izikiel 42

Otu a ka ọnụ ụzọ e si abanye nʼime ọnụụlọ ndị a dị na ndịda si dị. E nwere ọnụ ụzọ na mpụta, nke dị na mgbidi ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ. Ebe a ka e si abanye nʼime ọnụụlọ ndị ahụ.

Ezekiel 42:12 (UKJV) And according to the doors of the chambers that were toward the south was a door in the head of the way, even the way directly before the wall toward the east, as one enters into them.

10Nʼakụkụ ndịda, nʼogologo aja ụlọ dị nʼogige mpụta, nke dị nʼakụkụ ogige ụlọnsọ ukwu, nke chere aja ụlọ mpụta ihu, ọtụtụ ọnụụlọ dị ya.

11Ụzọ njegharị dị nʼetiti akụkụ abụọ ụlọ ahụ, ha dịkwa ka ọnụụlọ ndị ahụ nke dị nʼụzọ ugwu. Ogologo ha na obosara ha bụ otu; ha niile yiri onwe ha. Ọnụ ụzọ ya dịkwa ka ọnụ ụzọ dị nʼugwu.

12Otu a ka ọnụ ụzọ e si abanye nʼime ọnụụlọ ndị a dị na ndịda si dị. E nwere ọnụ ụzọ na mpụta, nke dị na mgbidi ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ. Ebe a ka e si abanye nʼime ọnụụlọ ndị ahụ.

13Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ime ọnụụlọ niile dị nʼugwu, na ime ọnụụlọ ndị dị na ndịda, bụ ndị a chere ogige ụlọnsọ ahụ ihu, bụ ime ụlọ dị nsọ, nke ndị nchụaja. Ebe ndị nchụaja ndị na-abịa nso Onyenwe anyị ịchụ aja ga-anọ rie nri niile nke kachasị nsọ, nʼebe ahụ ka ha ga-edebekwa aja ịnata ihuọma, aja mmehie na aja ikpe ọmụma, nʼihi na ụlọ ndị a dị nsọ.

14Mgbe ndị nchụaja bara nʼime ebe nsọ ahụ nke e kewapụrụ iche, ha aghaghị esikwa nʼebe ahụ pụta nʼogige mpụta ezi, tupu ruo mgbe ha yisara uwe ha yii jee ozi, nʼihi na uwe ndị a dị nsọ. Ha ga-eyiri uwe ọzọ, tupu ha abanye nʼakụkụ ụlọ ndị ahụ dịịrị ndị ọzọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.