Izikiel 44

Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, o nweghị onye ala ọzọ ọbụla a na-ebighị anụ ahụ ya na obi ya ugwu kwesiri ịbata nʼụlọnsọ m. Ọ bụladị ndị ọbịa ndị bi nʼetiti ụmụ Izrel.

Ezekiel 44:9 (UKJV) Thus says the Lord GOD; No stranger, uncircumcised in heart, nor uncircumcised in flesh, shall enter into my sanctuary, of any stranger that is among the children of Israel.

7Nʼihi na ọ bụghị naanị na ihe arụ unu mere dị ukwu, kama unu mekwara ihe arụ kachasị site nʼịkpọbata ndị ala ọzọ a na-ebighị anụ ahụ ha na obi ha ugwu nʼime ụlọnsọ, si otu a merụọ ụlọnsọ mgbe unu na-ewetara m nri nsọ, nke bụ abụba na ọbara. Nʼụzọ dị otu a, unu emebiela ọgbụgba ndụ m.

8Unu edebeghị iwu m nyere unu banyere ihe m ndị dị nsọ, kama unu goro ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-elekọta ebe nsọ m.

9Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, o nweghị onye ala ọzọ ọbụla a na-ebighị anụ ahụ ya na obi ya ugwu kwesiri ịbata nʼụlọnsọ m. Ọ bụladị ndị ọbịa ndị bi nʼetiti ụmụ Izrel.

10“ ‘Ndị ikom agbụrụ Livayị niile, ndị sitere nʼijere m ozi wezuga onwe ha mgbe Izrel bidoro ịgbaso arụsị niile ha, ga-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha.

11Ha ga-abụ ndị na-eje ozi nʼime ebe nsọ m, ndị nlekọta nke ọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwuu, na-ejekwa ozi nʼime ya; ha ga-egburu ndị m anụ e wetara maka ịchụ aja nsure ọkụ na nke aja ndị ọzọ, ha ga-eguzokwa nʼihu ha jeere ha ozi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.