11Ka ihe ọtụtụ homa bụrụ ihe unu ga-eji na-atụ ihe niile, ma mmanụ, ma ọka. Ihe ọtụtụ ndị ọzọ unu ga-enwe ga-abụ efa, nke bụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka ọka. Nke ọzọ bụ baf, nke bụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka mmanụ.
12Ihe ọtụtụ a ga-eji mata ịdị arọ nke ihe ọbụla ga-abụ shekel. Ihe a ga-eji gbanwere shekel a bụ iri gera abụọ naanị. Iri shekel isii ka a ga-ejikwa gbanwere otu mina.
13“ ‘Nke a bụ onyinye pụrụ iche unu ga-enye: otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa, site nʼotu homa nke ọka wiiti unu. Unu ga-enyekwa otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa site nʼotu homa ọka balị unu.
14Dịka e nyere ya nʼiwu, unu ga-eji ihe ọtụtụ baf, weta mmanụ oliv bụ otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼotu kọ ọbụla (kọ na-erita baf iri, nʼihi na baf iri, bụ ọtụtụ otu homa).
15Ọzọkwa, otu atụrụ nke sitere nʼigwe atụrụ dị narị atụrụ abụọ, nke si nʼebe ịta nri nke Izrel a gbara mmiri nke ọma ka unu ga-eweta. A ga-eji ndị a chụọ aja mkpụrụ ọka, na aja nsure ọkụ, na aja udo, maka ikpuchiri ndị wetara ha mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.