Izikiel 45

Ọ ga-abụ oke ala ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼebe nsọ, na ndị na-abịa nso ije ozi nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-abụkwa ebe ụlọ obibi ha ga-adị, bụrụkwa ebe dị nsọ maka ebe nsọ ahụ.

Ezekiel 45:4 (UKJV) The holy portion of the land shall be for the priests the ministers of the sanctuary, which shall come near to minister unto the LORD: and it shall be a place for their houses, and an holy place for the sanctuary.

2Site nʼala, otu akụkụ dị narị mita abụọ na iri itoolu na otu, na iri sentimita asaa na ise, ga-abụ maka ebe nsọ. A ga-ahapụ ala dị iri mita abụọ na itoolu gburugburu ya.

3Site nʼoke ebe ahụ dị nsọ, tụpụta oke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, obosara ya kilomita ise na ọkara. Ọ bụ nʼime ya ka ebe nsọ, ya bụ Ebe ahụ Kachasị Nsọ ga-adị.

4Ọ ga-abụ oke ala ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼebe nsọ, na ndị na-abịa nso ije ozi nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-abụkwa ebe ụlọ obibi ha ga-adị, bụrụkwa ebe dị nsọ maka ebe nsọ ahụ.

5Ala ọzọ dị ya nʼakụkụ, nke ga-adị kilomita iri na atọ nʼogologo, kilomita ise na ọkara nʼobosara ya, ga-abụ ebe obibi ndị Livayị, ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwuu ahụ.

6“ ‘Nʼakụkụ obodo nsọ ka a ga-ekewapụta ala nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dịkwa kilomita abụọ na ọkara, nke a ga-abụ nke ndị Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.