6“ ‘Nʼakụkụ obodo nsọ ka a ga-ekewapụta ala nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dịkwa kilomita abụọ na ọkara, nke a ga-abụ nke ndị Izrel.
7“ ‘A ga-ewepụta ala pụrụ iche maka nwa eze. Ala a ga-adị nʼakụkụ abụọ nke ala nsọ ahụ, na obodo ahụ. Ala a ga-agbatịrị site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ebe oke ya dị ruo nʼosimiri Mediterenịa. Ọ ga-esitekwa nʼoke ala ya nʼọwụwa anyanwụ gbatịrị ruo nʼebe ebo Izrel nwere ala ha. Nʼụzọ dị otu a, ala a ga-aha ka ala ebo Izrel ketara.
8Ala a ga-abụrụ ya ihe nketa nʼIzrel. Ndịisi m agaghị emegbu ndị m ọzọ, ma ha ga-ahapụ ndị Izrel ka ha keta ala ndị a dịka ebo niile ha si dị.
9“ ‘Nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: O zuolara unu, unu ụmụ ndị eze Izrel. Kwụsịnụ ịpụnara ndị m ihe ha nwere nʼike, kpeenụ ikpe ziri ezi na-emekwa ihe kwesiri ekwesi. Kwụsịnụ ịchụpụ ndị m site nʼihe ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
10Ka ihe ọtụtụ unu ji ere ahịa unu bụrụ ezigbo efa na ezigbo baf nke a na-ejighị aghụghọ kpụọ.