Izikiel 46

Ya mere, ha ga-edozi nwa atụrụ na ụtụ ọka na mmanụ oliv ahụ, kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ, maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa mgbe niile.

Ezekiel 46:15 (UKJV) Thus shall they prepare the lamb, and the food offering, and the oil, every morning for a continual burnt offering.

13“ ‘Ọ bụ nwa atụrụ gbara otu afọ nke na-enweghị ntụpọ ka ị ga-eweta ụbọchị niile maka ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ọ bụ kwa ụtụtụ, kwa ụtụtụ ka ị ga-eweta ya.

14Ị ga-ewetakwa onyinye mkpụrụ ọka kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ tinyere ya, ihe niile ga-emejupụta ya bụ lita ụtụ ọka isii, na lita mmanụ abụọ e ji agwakọta ya. Iche onyinye mkpụrụ ọka a nʼihu Onyenwe anyị bụ ụkpụrụ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

15Ya mere, ha ga-edozi nwa atụrụ na ụtụ ọka na mmanụ oliv ahụ, kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ, maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa mgbe niile.

16“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ọ bụrụ na onyeisi enye onye ọbụla nʼime ụmụ ya ndị ikom onyinye site nʼihe nketa ya, ihe ahụ ga-abụ nke ya, bụrụkwa nke mkpụrụ ya, ọ ga-abụ oke ha site nʼihe nketa ruo ebighị ebi.

17Ọ bụrụkwanụ na o kenye otu nʼime ndị ohu ya ala site nʼihe nketa ya, ala ahụ ga-abụ nke ohu ahụ tutu ruo nʼafọ inwere onwe, nke bụ afọ asaa ọbụla. Mgbe ahụ, ohu ahụ ga-enwere onwe ya, ma ala ahụ ga-aghọkwa nke nwa eze ahụ. Ihe nketa ya bụ nke dịịrị naanị ụmụ ya, nke ha ka ọ bụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.