Izikiel 48

Ma nke ga-afọdụ na ya, nʼakụkụ oke ala ahụ dị nsọ nke gara ogologo ya niile, ga-abụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ kilomita ise na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụkwa kilomita ise na ọkara. Ihe omume ya ga-abụ nri nye ndị ọrụ nke obodo ahụ.

Ezekiel 48:18 (UKJV) And the residue in length opposite to the oblation of the holy portion shall be ten thousand eastward, and ten thousand westward: and it shall be opposite to the oblation of the holy portion; and the increase thereof shall be for food unto them that serve the city.

16nke ogologo akụkụ ugwu ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ndịda ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ọwụwa anyanwụ ruru kilomita abụọ na ụma anọ, na akụkụ ọdịda anyanwụ rukwara kilomita abụọ na ụma.

17Ogologo nke ala ebe ịta nri nke ga-agba obodo ahụ gburugburu ga-aha nʼotu. Ọ ga-adị narị mita na iri mita atọ na ise nʼugwu, na ndịda narị mita na iri mita atọ na ise, nʼọwụwa anyanwụ narị mita na iri mita atọ na ise, nʼakụkụ nʼọdịda anyanwụ narị mita na iri mita atọ na ise.

18Ma nke ga-afọdụ na ya, nʼakụkụ oke ala ahụ dị nsọ nke gara ogologo ya niile, ga-abụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ kilomita ise na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụkwa kilomita ise na ọkara. Ihe omume ya ga-abụ nri nye ndị ọrụ nke obodo ahụ.

19Ndị ọrụ si nʼobodo, bụ ndị na-akọ ya ga-abụkwa ndị sị nʼebo niile nke Izrel.

20Ala ahụ niile, ma ala ahụ e doro nsọ, ma ala ndị obodo, ga-adị kilomita iri na atọ nʼakụkụ ya ọbụla.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.