1“Nke a bụ aha ebo niile, na ala ha ga-eketa: “Dan otu oke. Site na nsọtụ ugwu, nʼakụkụ ụzọ Hetlon ruo mbata Hamat. Haza Enan na oke ala ugwu Damaskọs, nke dị nʼakụkụ Hamat ga-abụ akụkụ oke ala ha site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
2Asha ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Dan, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
3Naftalị ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Asha, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
4Manase nwere otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Naftalị, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.