5“Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nke a bụ Jerusalem, obodo m mere ka ọ dịrị nʼetiti mba dị nʼụwa, nke mba dị iche iche gbara gburugburu.
6Ma o sitela nʼajọ omume ya, nupu isi nʼiwu na ụkpụrụ m nyere, karịa mba na obodo ndị ọzọ ahụ niile gbara ya gburugburu. Ọ jụkwara idebe iwu m, jụkwa ịgbaso ụkpụrụ m.
7“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ị bụrụla onye nnupu isi karịa mba niile ndị gbara gị gburugburu. Ị jụkwara idebe iwu m na ịgbaso ụkpụrụ m, ọ bụghịkwa dịka iwu na atụmatụ nke mba dị iche iche nọ gị gburugburu ka ị mere.
8“Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-emegide gị bụ Jerusalem, kpee gị ikpe nʼihu mba niile.
9Nʼihi ihe arụ gị niile, aga m eme gị ihe m na-emebeghị mbụ, nke m agaghị emekwa ọzọ.