15Mma agha dị nʼezi; ajọ ọrịa na-efe efe na ụnwụ dịkwa nʼime. Onye nọ nʼọhịa ga-anwụ site na mma agha, ndị nọ nʼime obodo ukwu ka ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịa.
16Ma ndị gbapụrụ agbapụ ga-agbaga nọrọ nʼugwu. Ọ bụ dịka nduru nke ndagwurugwu, ha niile ga-asụ ude akwa, onye ọbụla nʼihi mmehie ha.
17Aka niile ga-akụda, ikpere niile ka a ga-eji amịrị nyụdee.
18Ha ga-eyikwasị akwa mkpe, oke ihe egwu ga-ekpuchi ha. Ọ bụkwa ihu niile ka ihere ga-ekpuchi, a ga-akpụchakwa isi niile.
19“ ‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha. Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị enwe ike napụta ha nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị. Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha, maọbụ mee ka afọ ju ha, nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie.