11Nʼihu ihe ndị a, ka iri ndị okenye asaa nke ụlọ Izrel, ha na Jaazanaya nwa Shefan guzo nʼebe ahụ. Onye ọbụla nʼime ha ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼaka ya, anwụrụ ọkụ si nʼihe nsure ọkụ ndị a na-agbagokwa elu.
12Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụla ihe ndị okenye ụlọ Izrel na-eme nʼọchịchịrị, onye ọbụla nʼime ụlọ ya nʼihu arụsị ya? Ma ha na-asị, ‘Onyenwe anyị adịghị ahụ anyị, O sitela nʼala anyị wezuga onwe ya.’ ”
13Ọzọ, ọ sịrị m, “Ị ga-ahụkwa oke ihe arụ karịrị ndị a ha na-eme!”
14O mere ka m bịakwa nʼọnụ ụzọ ahụ dị nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼebe ahụ, ahụrụ m ndị inyom nọ na-akwa akwa nʼihi Tamuz, chi ha.
15Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ị hụla ihe ndị a, nwa nke mmadụ? Ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.”