Ezra 4

Ma Zerubabel, na Jeshua na ndịisi ọzọ zara sị ha, “Unu enweghị oke ọbụla nʼọrụ iwuru Chineke anyị ụlọnsọ. Naanị ndị anyị ga-ewuru Onyenwe anyị, Chineke Izrel ụlọ ukwu a dịka Sairọs eze Peshịa nyere nʼiwu.”

Ezra 4:3 (UKJV) But Zerubbabel, and Jeshua, and the rest of the chief of the fathers of Israel, said unto them, All of you have nothing to do with us to build an house unto our God; but we ourselves together will build unto the LORD God of Israel, as king Cyrus the king of Persia has commanded us.

1Mgbe ndị iro Juda na Benjamin nụrụ na ndị ahụ a dọtara nʼagha alọtala, nụkwa na ha na-ewugharị ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, Chineke Izrel,

2ha bịakwutere Zerubabel na ndịisi ezinaụlọ sị ha, “Kwerenụ ka anyị nyere unu aka nʼọrụ iwu ụlọ a, nʼihi na anyị hụrụ Chineke unu nʼanya dịka unu onwe unu si hụ ya nʼanya. Lee na kemgbe Isahadon eze Asịrịa butere anyị nʼebe a, anyị alabeghị azụ ịchụrụ ya aja.”

3Ma Zerubabel, na Jeshua na ndịisi ọzọ zara sị ha, “Unu enweghị oke ọbụla nʼọrụ iwuru Chineke anyị ụlọnsọ. Naanị ndị anyị ga-ewuru Onyenwe anyị, Chineke Izrel ụlọ ukwu a dịka Sairọs eze Peshịa nyere nʼiwu.”

4Ya mere ndị niile nọ ha gburugburu malitere ime ihe ga-ewetara ndị Juda ịda mba nʼobi, na ihe ga-eme ka ụjọ tụọ ha ịga nʼihu nʼọrụ iwu ụlọ ahụ.

5Ha ji ngarị gota ụfọdụ ndịisi ka ha megide ha, mebikwaa atụmatụ ha niile nʼoge niile Sairọs bụ eze Peshịa, ruokwa nʼoge Daraiọs ghọrọ eze ọhụrụ Peshịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.