Ezra 4

Na mmalite ọchịchị Sekses, ha deere ya akwụkwọ ebubo megide ndị Juda na Jerusalem.

Ezra 4:6 (UKJV) And in the reign of Ahasuerus, in the beginning of his reign, wrote they unto him an accusation against the inhabitants of Judah and Jerusalem.

4Ya mere ndị niile nọ ha gburugburu malitere ime ihe ga-ewetara ndị Juda ịda mba nʼobi, na ihe ga-eme ka ụjọ tụọ ha ịga nʼihu nʼọrụ iwu ụlọ ahụ.

5Ha ji ngarị gota ụfọdụ ndịisi ka ha megide ha, mebikwaa atụmatụ ha niile nʼoge niile Sairọs bụ eze Peshịa, ruokwa nʼoge Daraiọs ghọrọ eze ọhụrụ Peshịa.

6Na mmalite ọchịchị Sekses, ha deere ya akwụkwọ ebubo megide ndị Juda na Jerusalem.

7Nʼụbọchị niile ahụ Ataksekses bụ eze ndị Peshịa, ka Bishlam, na Mitredat, na Tabeel, na ndị otu ya fọdụrụ degaara Ataksekses akwụkwọ. E dere akwụkwọ ozi ahụ nʼodide akwụkwọ ndị Aramaik, a sụgharịkwara ya nʼasụsụ Aramaik.

8Ndị ọzọ soro ha gbaa ajọ izu a bụ Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ. Ha deere Ataksekses akwụkwọ megide ndị Jerusalem sị ya:

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.