Ezra 6

Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze Daraiọs zitere, Tatenai, onyeisi ọchịchị nʼala ofe mmiri, na Sheta Bozenai, na ndị otu ha, mere ihe niile dịka ozi ahụ si dị na-atụfughị oge ọbụla.

Ezra 6:13 (UKJV) Then Tatnai, governor on this side the river, Shetharboznai, and their companions, according to that which Darius the king had sent, so they did speedily.

11Ana m enye iwu na onye ọbụla ga-agbanwe okwu a, ka ehopụta osisi nʼụlọ ya jiri kwụgbuo ya. A ga-emekwa ụlọ ya ka ọ bụrụ ebe ikpofu ahịhịa.

12Chineke ahụ, onye mere Jerusalem ebe obibi ya, ga-ebibi eze ọbụla maọbụ mba ọbụla gbanwere iwu a, maọbụ bibie ụlọnsọ ahụ ọzọ. Ọ bụ Daraiọs na-enye iwu a. Ka onye ọbụla were ike ya niile debe ya.

13Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze Daraiọs zitere, Tatenai, onyeisi ọchịchị nʼala ofe mmiri, na Sheta Bozenai, na ndị otu ha, mere ihe niile dịka ozi ahụ si dị na-atụfughị oge ọbụla.

14Nʼihi ya, ndịisi Juu gara nʼihu nʼọrụ, ihe na-agakwara ha nke ọma site na nkwusa onye amụma, bụ Hegai, na Zekaraya, nwa Ido. Ha wuchara ụlọnsọ ahụ dịka iwu Chineke Izrel nyere si dị, nakwa dịka Sairọs, na Daraiọs, na Ataksekses, ndị eze Peshịa, nyekwara nʼiwu.

15Ha wusiri ya nʼabalị nke atọ nʼọnwa isii (dị ka ọgụgụ afọ ndị Juu si dị) nʼafọ nke isii nke ọchịchị Daraiọs.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.