20Ndị nchụaja na ndị Livayị edoola onwe ha ọcha, ha niile dịkwa ọcha. Ndị Livayị nʼonwe ha gburu ọtụtụ atụrụ Mmemme Ngabiga maka ndị nchụaja, na ndị Livayị ndị ọzọ, na ndị ahụ niile lọtara alọta site na mba ọzọ.
21Ya mere, ndị Izrel niile bụ ndị ahụ lọtara site nʼebe e mere ka ha gaa biri riri ihe ahụ, ha na ndị ahụ niile kewapụrụ onwe ha juu ibi ajọọ ndụ nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na-ebi, nʼihi ịchọ Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel.
22Ha sokwa mee mmemme achịcha na-ekoghị eko, nke ha mere ụbọchị asaa. Oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile nʼihi na Onyenwe anyị mere ka eze Asịrịa nwee obiọma nʼebe Izrel nọ, nyere ha aka iwugharị ụlọnsọ ukwu Chineke, onye bụ Chineke Izrel.