Ezra 7

Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke nna nna anyị ha, onye mere ka eze kpebie ime ka ụlọnsọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem dị mma ile anya.

Ezra 7:27 (UKJV) Blessed be the LORD God of our fathers, which has put such a thing as this in the king's heart, to beautify the house of the LORD which is in Jerusalem:

25“Ugbu a, Ezra, ị ga-eji amamihe Chineke gị nyere gị họpụta ndị ikpe, na ndịisi, ndị ga-achị obodo niile dị nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis. Ọ bụrụ na ha amazighị iwu Chineke nke ọma, ị ga-akụziri ha.

26Ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla jụrụ idebe iwu Chineke, na iwu eze, ga-abụ ọnwụ, maọbụ nchụpụ site nʼala ya gaa mba ọzọ, maọbụ ịnakọrọ ya ihe niile o nwere, maọbụ ịtụba ya nʼụlọ mkpọrọ.”

27Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke nna nna anyị ha, onye mere ka eze kpebie ime ka ụlọnsọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem dị mma ile anya.

28Keleekwa Chineke onye nyere m ihuọma nʼihu ndị ndụmọdụ ya, na nʼihu ụmụ eze, bụ ndịisi ọchịchị dị ike. Nʼihi na aka Onyenwe anyị Chineke m nọnyeere m. Eji m obi ike chịkọta ndịisi site nʼIzrel ka ha soro m gaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.