4Meraiot nwa Zerahaya; Zerahaya nwa Uzi, Uzi nwa Buki;
5Buki nwa Abishua, Abishua nwa Finehaz; Finehaz nwa Elieza, Elieza nwa Erọn onyeisi nchụaja.
6Ezra a si Babilọn bịarute. Ọ bụ onye ọka nʼihe gbasara iwu ahụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel nyere Mosis. Eze nyere ya ihe niile nke ọ rịọrọ, nʼihi na aka Onyenwe anyị Chineke ya dịkwasịrị nʼahụ ya.
7Ụfọdụ ndị Izrel, ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị nche na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, soro ya jee Jerusalem nʼafọ asaa nke ọchịchị eze Ataksekses.
8Ezra bịaruru Jerusalem nʼọnwa nke ise, nke afọ asaa nke ọchịchị eze.