Ezra 8

Anyị hapụrụ osimiri Ahava nʼụbọchị nke iri na abụọ nke ọnwa mbụ, chee ihu anyị ịga Jerusalem. Chineke nọnyekwaara anyị, dọpụta anyị site nʼaka ndị iro ọbụla, na nʼaka ndị ohi.

Ezra 8:31 (UKJV) Then we departed from the river of Ahava on the twelfth day of the first month, to go unto Jerusalem: and the hand of our God was upon us, and he delivered us from the hand of the enemy, and of such as lay in wait by the way.

29Chenụ ha nche, debekwa ha nke ọma, tupu ruo mgbe unu ga-atụ ha nʼihu ndịisi nchụaja, na ndịisi Livayị, na ndịisi ụlọ nke Izrel nʼime Jerusalem, nʼime ụlọakụ nke ụlọ Onyenwe anyị.”

30Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị kwenyere ibu ọlaọcha na ọlaedo, na ngwongwo ihe nsọ ndị ahụ, buga ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem.

31Anyị hapụrụ osimiri Ahava nʼụbọchị nke iri na abụọ nke ọnwa mbụ, chee ihu anyị ịga Jerusalem. Chineke nọnyekwaara anyị, dọpụta anyị site nʼaka ndị iro ọbụla, na nʼaka ndị ohi.

32Nʼikpeazụ, anyị rutere Jerusalem nʼudo, zukwaa ike ụbọchị atọ.

33Nʼụbọchị nke anọ, site nʼoge anyị ruru, e jiri ihe ọtụtụ tụọkwa ọlaọcha na ọlaedo ahụ, ha na ngwongwo ihe nsọ ndị ọzọ ahụ. E mere nke a nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Ndị tụrụ ha bụ Meremot nwa Ụraya onye nchụaja, na Elieza nwa Finehaz. Jozabad nwa Jeshua, na Noadaya nwa Binui, ndị Livayị, sokwa tụọ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.