14Abụ m otu nʼime ndị amaara aha ha nʼetiti ndị ọgbọ m, nʼihe banyere ofufe ndị Juu. Nʼihi oke ịnụ ọkụ nʼobi nke m nwere ịgbaso na idebezu ụkpụrụ omenaala na ofufe, nke nna nna m ha.
15Ma mgbe ọ tọrọ Chineke ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya,
16ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya.
17Ejekwaghị m Jerusalem ịhụ ndị ahụ bu m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama a gara m Arebịa, ma laghachikwa azụ na Damaskọs.
18Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ịhụ Sefas. Anọnyekwara m ya ụbọchị iri na ise.