4Onye nyere onwe ya nʼihi mmehie anyị niile dị ka nzube Chineke bụ Nna anyị si dị, ịzọpụta anyị site nʼoge ọjọọ a nke anyị bi nʼime ya.
5Onye otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
6O juru m anya, na unu esitela nʼebe onye ahụ kpọrọ unu site nʼamara Kraịst wezuga onwe unu, na-agbaso oziọma ọzọ,
7nke na-abụghị oziọma. O doro anya na ụfọdụ mmadụ na-etinye unu nʼọnọdụ mgbagwoju anya, mgbe ha na-agbalị ịgbanwe oziọma nke Kraịst.
8A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere nʼeluigwe bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ.