Ndị Galeshịa 5

Ọ bụrụ na unu na-akọcha ibe unu, na-eji ọnụ unu na-ekwutọ ha, kpacharanụ anya ka unu hapụ ịla onwe unu nʼiyi.

Galatians 5:15 (UKJV) But if all of you bite and devour one another, take heed that all of you be not consumed one of another.

13Nʼihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu ekwela ka mnwere onwe unu bụrụ ohere nye anụ ahụ unu, kama werenụ ịhụnanya na-agbara ibe unu odibo.

14Nʼihi na ọ bụrụ na a chịkọta iwu niile nʼotu, ihe iwu niile na-ekwu bụ nke a, “Na-ahụnụ ndị ọzọ nʼanya dịka unu si hụ onwe unu nʼanya.”

15Ọ bụrụ na unu na-akọcha ibe unu, na-eji ọnụ unu na-ekwutọ ha, kpacharanụ anya ka unu hapụ ịla onwe unu nʼiyi.

16Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ.

17Nʼihi na ihe anụ ahụ chọrọ dị iche nʼihe Mmụọ Nsọ chọrọ. Ihe Mmụọ Nsọ chọrọ dịkwa iche nʼihe anụ ahụ chọrọ. Ịgba mgba dị nʼetiti ha na-eme ka ị hapụ inwe ike mee ihe ị chọrọ ime.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.