1Nʼoge ahụ, ụwa niile nwere naanị otu asụsụ, okwu niile bụkwa otu.
2Mgbe ndị mmadụ gbasara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ha chọtara ala dị larịị na Shaịna biri nʼebe ahụ.
3Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Bịanụ ka anyị kpụọ brik, kpọọ ha ọkụ nke ọma.” Ya mere, ha kpụrụ brik kama nkume, jirikwa bitumen kama ụrọ.